4. Nime ndia ndi ọlu-ha bu ichi achi n'ije-ozi ulo Jehova di orú nnù uzọ atọ; nnù ndikom iri-na-ise bu ndi-odozi-okwu na ndi-ikpe:
5. nnù ndikom iri bu ndi-ọnu-uzọ; nnù ndikom iri nēto Jehova n'ihe m'mere iji to Ya, ka Devid kwuru.
6. Devid we kè ha n'òkè, n'òkè, dika umu Livai si di; bú Giashon na Kohat, na Merari.
7. Nke ndi Giashon; Ladan na Shimai.
8. Umu-ndikom Ladan; onye-isi bu Jehiel, na Zitam, na Joel, atọ.
9. Umu-ndikom Shimai; Shel-omot, na Haziel, na Haran, atọ. Ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna umu Ladan.
10. Umu-ndikom Shimai kwa; Jahat, na Zina, na Jeush, na Beria. Anọ ndia bu umu Shimai.
11. Jahat bu onye-isi, Ziza bu kwa nke-abua: ma Jeush na Beria enweghi ọtutu umu-ndikom; ha we ghọ otù ulo nna site n'igukọta ha n'otù.