Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 23:18-32 Bible Nso (IGBOB)

18. Umu-ndikom Izha; Shelomit, bú onye-isi.

19. Umu-ndikom Hebron; Jeria, bú onye-isi, na Amaraia, bú nke-abua, na Jehaziel, bú nke-atọ, na Jekameam, bú nke-anọ.

20. Umu-ndikom Uziel; Maika, bú onye-isi, na Ishia, bú nke-abua.

21. Umu-ndikom Merari; Mahli na Mushi. Umu-ndikom Mahli; Eleeza na Kish.

22. Eleeza we nwua, ma o nweghi umu-ndikom, ọ bu nání umu-ndinyom: umu-nne-ha, bú umu-ndikom Kish, we luru ha na nwunye.

23. Umu-ndikom Mushi; Mahli, na Ida, na Jeremot, atọ.

24. Ndia bu umu Livai dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi-ha agukọtara, n'ọnu-ọgugu aha, onye na isi-ya onye na isi-ya, ndi nēje ozi ahu diri òfùfè ulo Jehova, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba.

25. N'ihi na Devid siri, Jehova, bú Chineke Israel, emewo ka ndi-Ya zuru ike; Ọ nēbi kwa nime Jerusalem rue mb͕e ebighi-ebi:

26. ọzọ kwa, ndi Livai agaghi-enwe ibūru ebe-obibi na ihe-ya nile diri òfùfè-ya.

27. N'ihi na n'okwu ikpe-azu Devid ka edere ndia, bú ọnu-ọgugu umu-ndikom Livai site n'onye b͕ara orú arọ we gaba.

28. N'ihi na ebe-nguzo-ha di n'akuku umu Eron ifè òfùfè ulo Jehova, n'ogige nile, na n'ime-ulo nile, na n'ime ka ihe nsọ ọ bula di ọcha, bú ọlu òfùfè ulo Chineke;

29. na idozi achicha anēdo n'usoro, na idozi utu oka flour iji nye onyinye-inata-iru-ọma, na idozi mbadamba-achicha ekoghi-eko, na idozi ihe esiri n'ite isi ihe, na idozi ihe edere edè, na idebe ihe ọ bula itù ihe di miri miri na ihe ọ bula itù ihe ọzọ;

30. na iguzo kwa-ututu ikele na ito Jehova, otú a kwa n'anyasi;

31. na isurere Jehova àjà-nsure-ọku nile, n'ubọchi-izu-ike nile, na n'ọnwa ọhu nile, na nime mb͕e nile akara àkà, n'ọnu-ọgugu dika ikpe ekpere ha si di, mb͕e nile n'iru Jehova:

32. ka ha we debe kwa ihe-ndebe ulo-ikwū nzute, na ihe-ndebe ebe nsọ ahu, na ihe-ndebe umu Eron, bú umu-nne-ha, bayere òfùfè ulo Jehova.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 23