Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 22:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Devid we si, Nka bu ulo Jehova, bú Chineke, nka bu-kwa-ra Israel ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku.

2. Devid we si ka achikọta ndi-ọbìa ndi nọ n'ala Israel; o we guzo ndi nāwa nkume iwa nkume awaputara awaputa iwu ulo Chineke.

3. Devid dozi-kwa-ra ígwè riri nne ikpuru ibo ọnu-uzọ-ama nile ǹtú, na ikpu ihe-njikọta nile; na ọla riri nne nke anātùghi atù;

4. na osisi cedar nādighi ọnu-ọgugu: n'ihi na ndi Zaidon na ndi Taia butere osisi cedar riri nne nye Devid.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 22