6. Agha we di ọzọ na Gat, ma otù nwoke toro ogologo nọ n'ebe ahu, nkpisi aka-ya abua di isi isi, nkpisi ukwu-ya abua di kwa isi isi, ha nile di orú na anọ; ma amu-kwa-ra onye ahu nye Rafa.
7. Ọ ta Israel uta, Jonatan nwa Shimea, bú nwa-nne Devid, we tib͕ue ya.
8. Ndia ka amuru nye Rafa nime Gat; ha we da site n'aka Devid, na site n'aka ndi-orù-ya.