O rue, na mb͕e ọb͕ub͕a arọ, na mb͕e ndi-eze nāpu ibu agha, na Joab dupuru ndi-dìnkpà nke usu-ndi-agha, bibie ala umu Amon, bia, nọchigide Raba n'agha. Ma Devid nānọdu na Jerusalem. Joab we tib͕ue Raba, kwada kwa ya.