7. Mb͕e ahu, n'ubọchi ahu, Devid buru uzọ nye iwu ikele Jehova, site n'aka Esaf na umu-nne-ya.
8. Kelenu Jehova, kpọkuenu aha-Ya;Menu ka amara omume-Ya nile n'etiti ndi nile n'uwa.
9. Bùkuenu Ya abù, bùkuenu Ya abù ọma;Tugharinu uche n'oké ọlu-Ya nile.
10. Nētonu onwe-unu n'aha nsọ Ya:Ka obi ndi nāchọ Jehova ṅuria.
11. Nāchọnu Jehova na ike-Ya;Chọnu iru-Ya mb͕e nile.
12. Chetanu oké ọlu-Ya nile nke Ọ luworo;Ihe-ebube-Ya nile, na ikpé nile nke ọnu-Ya;
13. Unu nkpuru Israel, bú orù-Ya,Umu Jekob, ndi-Ya arọputara.
14. Ya onwe-ya bu Jehova, bú Chineke-ayi:N'uwa nile ka ikpé-Ya nile di.
15. Chetanu ọb͕ub͕a-ndu-Ya rue mb͕e ebighi ebi,Okwu O nyere nnù ọb͕ọ abua na ọgu iri n'iwu;
16. Ọb͕ub͕a-ndu nke Ya na Abraham b͕ara,Na iyi-Ya Ọ ṅuru Aisak;
17. O we me ka o guzoro Jekob ibu ukpuru,Ka o guzoro Israel ibu ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi:
18. Si, Gi ka M'gēnye ala Kenean,Bú ala-nketa-unu eji udọ̀ tùa:
19. Mb͕e unu bu ndikom ole-na-ole;E, nání madu ole-na-ole, na ndi-ọbìa nime ya;
20. Ha we nējeghari si n'otù mba jerue mba ọzọ,Si n'otù ala-eze jerue ndi ọzọ.
21. O kweghi ka nwoke ọ bula meb͕ue ha;O we bara ndi-eze nba n'ihi ha;
22. Si, Unu emetula ndim etere manu aka,Unu emejo-kwa-la ndi-amumam.
23. Bùkuenu Jehova abù, unu uwa nile;Nēzisanu ozi nzọputa-Ya site n'otù ubọchi rue ubọchi ọzọ.
24. Kọsanu akukọ nsọpuru-Ya n'etiti mba nile,Akukọ oké ọlu-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche.
25. N'ihi na Jehova di uku, buru kwa onye anēto nke-uku:Onye anātu egwu Ya ka Ọ bu kwa n'elu chi nile.