Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 16:6-9 Bible Nso (IGBOB)

6. Benaia na Jehaziel, bú ndi-nchu-àjà, nāchiri kwa opì mb͕e nile, n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke.

7. Mb͕e ahu, n'ubọchi ahu, Devid buru uzọ nye iwu ikele Jehova, site n'aka Esaf na umu-nne-ya.

8. Kelenu Jehova, kpọkuenu aha-Ya;Menu ka amara omume-Ya nile n'etiti ndi nile n'uwa.

9. Bùkuenu Ya abù, bùkuenu Ya abù ọma;Tugharinu uche n'oké ọlu-Ya nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 16