5. ha bu: Esaf, bú onye-isi, na Zekaraia, bú onye nke-abua ya, na Jeiel, na Shemiramot, na Jehiel, na Matitaia, na Elaiab, na Benaia, na Obede-edom, na Jeiel, chiri une na ubọ-akwara; Esaf nēwere kwa ájà me ka anu udà-ha;
6. Benaia na Jehaziel, bú ndi-nchu-àjà, nāchiri kwa opì mb͕e nile, n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke.
7. Mb͕e ahu, n'ubọchi ahu, Devid buru uzọ nye iwu ikele Jehova, site n'aka Esaf na umu-nne-ya.
8. Kelenu Jehova, kpọkuenu aha-Ya;Menu ka amara omume-Ya nile n'etiti ndi nile n'uwa.
9. Bùkuenu Ya abù, bùkuenu Ya abù ọma;Tugharinu uche n'oké ọlu-Ya nile.
10. Nētonu onwe-unu n'aha nsọ Ya:Ka obi ndi nāchọ Jehova ṅuria.
11. Nāchọnu Jehova na ike-Ya;Chọnu iru-Ya mb͕e nile.
12. Chetanu oké ọlu-Ya nile nke Ọ luworo;Ihe-ebube-Ya nile, na ikpé nile nke ọnu-Ya;