Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 16:21-30 Bible Nso (IGBOB)

21. O kweghi ka nwoke ọ bula meb͕ue ha;O we bara ndi-eze nba n'ihi ha;

22. Si, Unu emetula ndim etere manu aka,Unu emejo-kwa-la ndi-amumam.

23. Bùkuenu Jehova abù, unu uwa nile;Nēzisanu ozi nzọputa-Ya site n'otù ubọchi rue ubọchi ọzọ.

24. Kọsanu akukọ nsọpuru-Ya n'etiti mba nile,Akukọ oké ọlu-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche.

25. N'ihi na Jehova di uku, buru kwa onye anēto nke-uku:Onye anātu egwu Ya ka Ọ bu kwa n'elu chi nile.

26. N'ihi na chi nile nke ndi nile di iche iche bu ihe-efu:Ma Jehova mere elu-igwe.

27. Ebube na ima-nma di n'iru Ya:Ike na ọṅù di n'ebe-Ya.

28. Nyenu Jehova, unu ab͕uru nke ndi nile di iche iche,Nyenu Jehova nsọpuru na ike.

29. Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya:Butenu onyinye-inata-iru-ọma, bia n'iru Ya:Kpọnu isi ala nye Jehova n'ima-nma nke idi-nsọ.

30. Ka o nēb͕u unu nb͕u site n'iru Ya, unu elu-uwa nile:Ọzọ, elu-uwa dum madu bi nēguzosi ike, adighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 16