Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 16:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Ha we bubata ib͕e Chineke, guzo ya n'etiti ulo-ikwū nke Devid mara nye ya: ha we weta nso àjà-nsure-ọku na àjà-udo n'iru Chineke.

2. Devid we surebìe àjà-nsure-ọku ahu na àjà-udo nile, gọzie ndi Israel n'aha Jehova.

3. Ọ we kesara madu ọ bula n'Israel, ma nwoke ma nwayi, madu ọ bula, otù ob͕e achicha, na otù ọkpurukpu anu, na otù mbadamba nkpuru-vine amiri ami.

4. O we tiye ufọdu nime ndi Livai n'iru ib͕e Jehova, bú ndi nēje ozi, ọbuná ime ka echeta na ikele na ito Jehova, bú Chineke Israel:

5. ha bu: Esaf, bú onye-isi, na Zekaraia, bú onye nke-abua ya, na Jeiel, na Shemiramot, na Jehiel, na Matitaia, na Elaiab, na Benaia, na Obede-edom, na Jeiel, chiri une na ubọ-akwara; Esaf nēwere kwa ájà me ka anu udà-ha;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 16