5. Ndi bi na Jebus we si Devid, I gaghi-abata n'ebe a. Devid we were ebe ewusiri ike nke Zaion; nke ahu bu obodo Devid.
6. Devid we si, Onye ọ bula nke buru uzọ tib͕u ndi Jebus gābu onye-isi na ọchi-agha. Joab nwa Zeruaia we buru uzọ rigo, o we buru onye-isi.
7. Devid we biri n'ebe ahu ewusiri ike; n'ihi ya ka ha kpọrọ ya obodo Devid.
8. O we wue obodo buruburu, site na Milo we rue buruburu ya: ma Joab mere ka obodo fọduru di ndu.
9. Devid we nāga n'iru, nēje nādi uku; Jehova nke usu nile nke ndi-agha nọye-kwa-ra ya.
10. Ma ndia bu ndi-isi nke ndi-dike Devid nwere, ndi mere onwe-ha ka ha di ike n'akuku ya n'ala-eze-ya, ha na Israel nile, ime ya eze, dika okwu Jehova si di bayere Israel.
11. Nka bu kwa ọnu-ọgugu ndi-dike Devid nwere: Jashọbeam, bú nwa onye-Hakmonait, onye-isi nke orú na iri ahu; o feghariri ube-ya imegide ọgu ndikom iri-na-ise, ha we ghọ ndi eb͕uru eb͕u n'otù ub͕ò.
12. Nke so ya bu Eleeza nwa Dodo, onye Ahoa, onye ahu di n'etiti ndi-dike atọ ahu.
13. Onye ahu nọyere Devid nime Pas-damim, ma ndi Filistia chikọtara onwe-ha n'ebe ahu ibu agha, òkè ubi nke juputara n'ọka barley di kwa; ma ndi Israel b͕alagara n'iru ndi Filistia.
14. Ha we guzo onwe-ha n'etiti òkè ahu, naputa ya, tib͕ue ndi Filistia; Jehova we zọputa nzọputa uku.
15. Ndikom atọ n'etiti orú ndi-isi na iri ahu we ridarue oké nkume ahu jekuru Devid, rue ọb͕à Adulam; ma ọmuma-ulo-ikwū ndi-Filistia amawo ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Refaim.
16. Ma Devid nọ n'ebe ahu ewusiri ike mb͕e ahu, ma ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia di na Bet-lehem mb͕e ahu.