Ma mb͕e Jọn nāb͕azu ọsọ-ya, ọ si, Gini ka unu nēchè na abum? Mu onwem abughi Ya. Kama, le, otù Onye nābia n'azum, Onye m'nēkwesighi itọpu akpukpọ-ukwu nke ukwu-Ya.