5. Ala Judia nile na ndi Jerusalem nile nāpukuru ya; ọ neme kwa ha baptism n'osimiri Jọdan, ha nēkwuputa nmehie nile ha.
6. Jọn nēyi aji camel, nēke kwa akpukpọ-ọkiké n'úkwù-ya, nēri kwa igurube na manu-aṅu nke ọhia.
7. Ọ nēkwusa kwa, si, Onye kam ike nābia n'azum, Onye m'nērughi iruru ala itọpu eriri akpukpọ-ukwu-Ya abua.
8. Mu onwem jiri miri me unu baptism; ma Onye ahu geji Mọ Nsọ me unu baptism.
9. O rue na mb͕e ahu, Jisus siri na Nazaret nke Galili bia, Jọn we mee Ya baptism nime Jọdan.
10. Ngwa ngwa mb͕e O si na miri nārigo, Ọ huru elu-igwe ka ha nādọwa, Ọ hu-kwa-ra Mọ Nsọ dika nduru ka Ọ nēfedakwasi Ya:
11. olu we si n'elu-igwe ahu da, si, Gi onwe-gi bu Ọkparam M'huru n'anya, ihe-Gi dim ezi nma.
12. Ngwa ngwa Mọ Nsọ we chua Ya ba n'ọhia.
13. O we nọ n'ọhia ọgu ubọchi abua, Setan nānwa Ya; Ya na anu ọhia nile nọ kwa; ndi-mọ-ozi nēje-kwa-ra Ya ozi.
14. Ma mb͕e arasiiri Jọn nye, Jisus biara na Galili, nēkwusa ozi ọma Chineke,
15. si, Oge ezuwo, ala-eze Chineke di kwa nso: chègharianu, kwe-kwa-nu n'ozi ọma.
16. Mb͕e Ọ nāga n'usọ oké osimiri Galili, O we hu Saimon na Andru nwa-nne Saimon ka ha nāwuye úb͕ú n'oké osimiri: n'ihi na ha bu ndi-ọkù.
17. Jisus we si ha, Bianu som n'azu, M'gēme kwa ka unu buru ndi-ọkù nākuta madu.