24. kele kwa, we nyawa ha, si, Nka bu arum, nke anēnye n'ihi unu: nēmenu nka ka unu we nēchetam.
25. Mb͕e ha risiri nri-anyasi, Ọ nara kwa iko otú ahu, si, Iko a bu ọb͕ub͕a-ndu ọhu nime ọbaram: nēmenu nka, mb͕e ọ bula unu gāṅu ya, ka unu we nēchetam.
26. N'ihi na mb͕e ọ bula unu nēri achicha nka, nāṅu kwa iko ahu, unu nēkwusa ọnwu Onye-nwe-ayi rue mb͕e Ọ gābia.
27. Ya mere onye ọ bula nke gēri achicha ahu ma-ọbu ṅu iko ahu nke Onye-nwe-ayi mb͕e ọ nēkwesighi, ikpé aru na ọbara nke Onye-nwe-ayi gāma ya.
28. Ma ka madu nwaputa onwe-ya, otú a ka o ri kwa nime achicha ahu, ṅu kwa nime iko ahu.
29. N'ihi na onye nēri nāṅu kwa, ọ nēri nāṅu kwa ikpé nye onwe-ya, ma ọ buru na ọ tuleghi aru ahu.
30. N'ihi nka ọtutu madu n'etiti unu adighi ike nāria kwa nriaria, ndi dawo-kwa-ra n'ura nke ọnwu abughi madu ole-na-ole.
31. Ma ọ buru na ayi atule onwe-ayi, agaghi-ekpe ayi ikpé.
32. Ma mb͕e anēkpe ayi ikpé, Onye-nwe-ayi nēzí ayi ihe, site n'inye ayi ahuhu, ka ewe ghara imakọ ayi na uwa ikpé.
33. Ya mere, umu-nnam, mb͕e unu biakọrọ n'otù ebe iri ihe, cherenu ibe-unu.
34. Ọ buru na agu nāgu onye ọ bula, ya rie ihe n'ulo-ya; ka unu ghara ibiakọ n'uzọ gēweta ikpé. Ihe nile fọduru ka m'gēdozi mb͕e ọ bula m'gābia.