19. na uwe nile akpara nke-ọma, iji je ozi n'ebe nsọ ahu, na uwe nsọ nile Eron, bú onye-nchu-àjà, nwere, na uwe umu-ya ndikom, ibu ndi-nchu-àjà.
20. Nzukọ nile nke umu Israel we si n'iru Moses pua.
21. Ha we bia, onye ọ bula nke obi-ya kwaliri ya, na onye ọ bula nke mọ-ya mere ka o nwe afọ-ofufo, ha we weta àjà-nbuli Jehova, iji je ozi ulo-ikwū nzute ahu, na iji fè òfùfè-ya nile, na iji me uwe nsọ ahu.
22. Ha we bia, ma ndikom ma ndinyom, onye ọ bula nke obi-ya nwere afọ-ofufo, ha we weta ihe-nkpọchi-uwe, na nb͕a-aka imi, na nb͕a-aka-akàrà, na ihe anēyi n'olu, ihe ọla-edo ọ bula; bú onye ọ bula nke fere àjà-ofufé ọla-edo nye Jehova.
23. Onye ọ bula nke achọtara n'aka-ya ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha, na aji ewu, na akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, na akpukpọ seal, chitara ha.
24. Onye ọ bula nke nēbuli àjà-nbuli nke ọla-ọcha na ọla wetara àjà-nbuli nke Jehova: nwoke ọ bula, nke achọtara osisi acacia n'aka-ya iji je ozi nke òfùfè ahu, we weta ya.
25. Nwayi ọ bula nke nwere obi amam-ihe were kwa aka-ya tu ogho, ha we weta ogho nke ha turu, bú ogho anunu ahu, na ogho ododo ahu, na ogho uhie ahu, na ezi ákwà ọcha ahu.
26. Ndinyom nile ndi obi-ha kwaliri ha n'amam-ihe tu-kwa-ra aji ewu.
27. Ndi-isi chitara nkume onyx, na nkume ihiọgide n'ihe, ihiọgide n'ephod ahu, na ihiọgide n'ihe-ib͕ochi-obi ahu;
28. na uda ahu, na manu ahu; itiye n'ihe nēnye ìhè, na ibu manu nke otite-manu ahu, na ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me.