23. Ha we sim, Mere ayi chi, ndi ganēje n'iru ayi: n'ihi na Moses a, bú nwoke nke mere ka ayi si n'ala Ijipt rigoputa, ayi amaghi ihe meworo ya.
24. M'we si ha, Onye ọ bula nke nwere ọla-edo, ka ha tijipu ya n'aru ha; ha we nyem: m'we tubà ya n'ọku, nwa-ehi a we puta.
25. Moses we hu ndi ahu na ndi nādighi nchikọta ka ha bu; n'ihi na Eron emewo ka ha ghara idi nchikọta, ka ha buru ihe-ntakwu n'etiti ndi nēbili imegide ha:
26. Moses we guzo n'ọnu-uzọ-ama nke ọmuma-ulo-ikwū ahu, si, Ònye diri Jehova? ya biakutem. Umu-ndikom Livai nile we chikọta onwe-ha n'ebe ọ nọ.
27. Ọ si ha, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Turunu, Nwoke ọ bula n'etiti unu, ya turu mma-agha-ya n'apata-ukwu-ya, gabiganu bia-ghachi kwa site n'otù ọnu-uzọ-ama rue ọnu-uzọ-ama ọzọ n'ọmuma-ulo-ikwū a nile, b͕u-kwa-nu, nwoke ọ bula, ya b͕ue nwa-nne-ya, nwoke ọ bula, ya b͕ue eyì-ya, nwoke ọ bula, ya b͕ue onye-aru-ya.
28. Umu-ndikom Livai we me dika okwu Moses si di: ihe ra ka nnù ndikom asa na ọgu iri we si n'etiti ndi Israel da n'ubọchi ahu.
29. Moses we si, Mejuenu aka-unu ta nye Jehova, n'ihi na nwoke ọ bula nēmegide nwa-ya nwoke, nēmegide kwa nwa-nne-ya nwoke; ka Ọ we nye unu ngọzi ta.
30. O rue, n'echi-ya, na Moses siri ndi Israel, Unu onwe-unu emehiewo nmehie uku: ma ub͕u a m'gārigokuru Jehova; eleghi anya m'gēkpuchi nmehie-unu.
31. Moses we jeghachikuru Jehova, si, Biko, ndi nka emehiewo nmehie uku, mere onwe-ha chi ọla-edo.
32. Ma ub͕u a, ọ buru na I gāb͕aghara nmehie-ha; ma ọ buru na I meghi ya, biko, hichapum n'akwukwọ-Gi nke I deworo.
33. Jehova we si Moses, Onye ọ bula nke mehieworo megidem, ya ka M'gēhi-chapu n'akwukwọm.
34. Ma ub͕u a, je, duru ndim rue ebe ahu nke M'gwaworo gi okwu bayere ya: le, mọ-ozim ganēje n'iru gi: ma n'ubọchi mb͕e M'nēleta, M'gēwere kwa nmehie-ha leta ha.
35. Jehova we tie ndi Israel ihe, n'ihi na ha mere nwa-ehi ahu, nke Eron mere.