Mb͕e i huru inyinya-ibu nke onye nākpọ gi asì ka ibu-ya nānyib͕u ya, ma i nāchọ ighara itọpuru ya ibu ahu, i ghaghi iyere ya aka itọpu ya.