23. Ab͕uru abua nke ndi Giashon nāma ulo-ikwū-ha n'azu ebe-obibi ahu chere iru n'Ọdida-anyanwu.
24. Onye-isi ulo nna ndi Giashon nwere bu Eliasaf nwa Lael.
25. Ihe-ndebe nke umu-ndikom Giashon n'ulo-ikwū nzute bu ebe-obibi na Ulo-ikwū, na ihe-nkpuchi-ya, na ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute,
26. na ákwà-ngechi nile nke ogige ahu, na ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ ogige, nke di n'akuku ebe-obibi, na n'akuku ebe-ichu-àjà buruburu, na udọ̀-ya nile bayere òfùfè-ya nile.
27. Nke Kohat bu ab͕uru ndi Amram, na ab͕uru ndi Izha, na Ab͕uru ndi Hebron, na aburu ndi Uziel: ndia bu ab͕uru ndi Kohat.
28. N'ọnu-ọgugu ndikom nile, site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru, ha di orú nnù na otù nnù ọgu iri, nēdebe ihe-ndebe nke ebe nsọ ahu.
29. Ab͕uru nile nke umu Kohat nāma ulo-ikwū-ha n'isi ebe-obibi ahu chere iru na Ndida.
30. Onye-isi ulo nna ab͕uru ndi Kohat nwere bu Elizafan nwa Uziel.
31. Ihe-ndebe-ha bu ib͕e ahu, na table ahu, na ihe-idọba-oriọna, na ebe-ichu-àjà abua, na ihe nile nke ebe nsọ ahu nke ha ji je ozi na ákwà-nkwuchi ahu, na òfùfè-ya nile.
32. Onye-isi nke ndi-isi nke ndi Livai bu Eleeza nwa Eron onye-nchu-àjà, ọ nwere nlekọta ndi nēdebe ihe-ndebe nke ebe nsọ ahu.
33. Nke Merari bu ab͕uru ndi Mahli, na ab͕uru ndi Mushi: ndia bu ab͕uru Merari.
34. Ndi-ha agukọtara agukọta, n'ọnu-ọgugu ndikom nile, site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru, di nnù iri-na-ise na ọgu iri.