7. Nke Juda, Nahshon nwa Aminadab.
8. Nke Isaka; Netanel nwa Zua.
9. Nke Zebulun; Eliab nwa Hilon.
10. Nke umu Josef: nke Efraim; Elishama nwa Amihud: nke Manase; Gameliel nwa Pedahzua.
11. Nke Benjamin; Abidan nwa Gideoni.
12. Nke Dan; Ahieza nwa Amishadai.
13. Nke Asha; Pagiel nwa Ọkran.
14. Nke Gad; Eliasaf nwa Deuel.
15. Nke Naftali; Ahira nwa Inan.
16. Ndia bu ndi akpọrọ nke nzukọ Israel, ndi-isi ebo nile nke ndi bu nna-ha; ndi-isi nke usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Israel ka ha bu.
17. Moses na Eron we chiri ndikom ndia nke akpọrọ n'aha n'aha:
18. ọ bu kwa nzukọ Israel nile ka ha kpọkọtara n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-abua, ha we kọ akukọ osuso-ọmumu-ha dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye na isi-ya onye na isi-ya.
19. Dika Jehova nyere Moses iwu, otú a ka ọ gukọtara ha n'ọzara Sainai.
20. Ma umu Reuben, bú ọkpara Israel, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, onye na isi-ya onye na isi-ya, nwoke ọ bula site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;