3. Ubọchi isi ka agēje ozi: ma n'ubọchi nke-asa, ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike gādi, bú nkpọkọta nsọ: ọ dighi ozi ọ bula unu gēje: ubọchi-izu-ike nke Jehova nwere ka ọ bu n'ebe-obibi-unu nile.
4. Ndia bu mb͕e akara àkà nke Jehova, bú nkpọkọta nsọ, nke unu gākpọsa na mb͕e-ha akara àkà.
5. N'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu n'etiti ehihie na anyasi, ka ngabiga nke diri Jehova gādi.
6. N'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa ahu ka ememe achicha ekoghi-eko gādi-kwa-ra Jehova: ubọchi asa ka unu gēri achicha ekoghi-eko.
7. N'ubọchi mbu unu gēnwe nkpọkọta nsọ: ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje.