8. na obodo ntà nile nke di obodo ndia buruburu rue Bealat-bia, bú Rema nke Negeb. Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Simeon dika ab͕uru nile ha si di.
9. Site n'òkè umu Juda ka ihe-nketa umu Simeon di: n'ihi na òkè umu Juda riri nne kari ha: umu Simeon we keta ihe n'etiti ihe-nketa-ha.
10. Ife-nzà nke-atọ we putara umu Zebulun dika ab͕uru nile ha si di: ókè-ala ihe-nketa-ha we di rue Sarid:
11. ókè-ala-ha we rigo n'akuku Ọdida-anyanwu, ru kwa Marala, we metu Dabeshet, metu kwa miri-iyi nke di n'iru Jọkneam;
12. o si na Sarid chigharia n'akuku Iru-anyanwu n'ọwuwa-anyanwu rue ókè-ala Kislot-teboa; ọ pua rue Daberat, we rigo rue Jafia;
13. o si n'ebe ahu gabiga n'akuku Iru-anyanwu n'akuku ọwuwa-anyanwu rue Gat-hefa, rue Et-kazin; ọ pua na Rimon, nke akpara rue Nea;
14. ókè-ala ahu we b͕a ya buruburu n'Ugwu rue Hanaton: ọpupu-ya di kwa na ndagwurugwu Ifta-el;
15. na Katat, na Nahalal, na Shimron, na Idala, na Bet-lehem: obodo iri na abua na obodo ntà ha.