1. Ife-nzà nke mara ebo Manase di kwa: n'ihi na ya onwe-ya bu ọkpara Josef. Ọ diri Makia ọkpara Manase, bú nna Gilead, n'ihi na onye ahu bu onye-agha, o we nwe Gilead na Beshan.
2. Ife-nzà di kwa nke mara umu Manase fọduru dika ab͕uru nile ha si di; ọ diri umu Abieza, di-kwa-ra umu Hilek, di-kwa-ra umu Asriel, di-kwa-ra umu Shekem, di-kwa-ra umu Hifa, di-kwa-ra umu Shemida: ndia bu umu-ndikom Manase nwa Josef dika ab͕uru nile ha si di.