1. Elifaz, bú onye Timan, we za, si,
2. Onye mara ihe, ọ̀ gēwere ọmuma-ihe nke bu nání ifufe za?Ọ̀ gēmeju kwa afọ-ya n'ifufe Iru-anyanwu?
3. Ọ̀ gēwere okwu nābaghi n'ihe ru uka,Ma-ọbu okwu nke ọ nējighi ha bara madu urù?
4. E, gi onwe-gi nēmebi egwu,Nēbilata kwa ntughari-uche n'iru Chineke.
5. N'ihi na ajọ omume-gi nēzi ọnu-gi ihe,I nārọputa kwa ire ndi-aghughọ.
6. Ọnu-gi nāma gi ikpe, ọ bughi mu onwem;Eb͕ub͕ere-ọnu-gi nāza kwa imegide gi.
7. Ì bu madu mbu amuru?Ma-ọbu àmuputara gi tutu ugwu adi?
8. Ọ̀ bu ìzù nzuzo Chineke ka i nēge nti?Ì nēbilata-kwa-ra onwe-gi amam-ihe?
9. Gini ka i mara nke ayi nāmaghi?Ì nāghọta ihe nke nādighi nime ayi?
10. Ma onye-isi-awọ ma onye kara nká nọ n'etiti ayi,Ndi ubọchi ndu-ha ka nke nna-gi nke-uku.
11. Ǹkasi-obi Chineke adikara gi ntà,Ha na okwu nke nēmeso gi nwayọ?
12. Gini mere obi-gi ji ebupu gi?Gini me-kwa-ra anya-gi abua ji atabi?
13. Na i nēchighari mọ-gi imegide Chineke,We me ka okwu nile di otú a si n'ọnu-gi puta.
14. Gini ka madu bu, na ọ gādi ọcha n'obi,Na ọ gābu kwa onye ezi omume, bú onye nwayi muru?
15. Le, ọbuná ndi nsọ Ya ka Ọ nādighi-atukwasi obi;Ọzọ, elu-igwe adighi ọcha n'anya-Ya.