Ma ihe-ihere ahu erichapuwo ihe putara na ndọb͕u nna-ayi-hà dọb͕uru onwe-ha n'ọlu site na mb͕e ayi di na nwata; ìgwè ewu na aturu-ha na ìgwè ehi-ha, na umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom.