8. Ub͕a a kwa, Ọ bughi unu onwe-unu ziterem n'ebe a, kama Chineke: O we mem ka m'ghọrọ Fero nna, na onye-nwe ulo-ya nile, na onye nāchi ala Ijipt nile.
9. Menu ngwa, rigokuru nnam, si ya, Otú a ka nwa-gi Josef siri, Chineke, emewom ka m'ghọ onye-nwe Ijipt nile: ridakutem, atula ujọ:
10. i gēbi n'ala Goshen, nọkwam nso, gi onwe-gi, na umu-gi, na umu umu-gi, na ìgwè ewu na aturu-gi, na ìgwè ehi-gi, na ndi nile i nwere:
11. m'gāzù kwa gi n'ebe ahu; n'ihi na arọ ise nke oké unwu fọduru; ka ewe ghara inapu gi ihe nile, gi onwe-gi, na ulo-gi, na ndi nile i nwere.
12. Ma, le, anya-unu na anya nwa-nnem, bú Benjamin, nāhu na ọ bu ọnum nāgwa unu okwu.
13. Unu gēgosi kwa nnam nsọpurum nile n'Ijipt, na ihe nile nke unu huworo; unu gēme kwa ngwa me ka nnam ridata n'ebe a.
14. Ọ we dakwasi Benjamin, bú nwa-nne-ya, n'olu, kwa ákwá; Benjamin kwa-kwa-ra ákwá n'olu-ya.
15. Ọ we sutu umu-nne-ya nile ọnu, kwakwasi ha ákwá: emesia umu-nne-ya kpayere ya uka.
16. Ewe nu ùdé-ya n'ulo Fero, si, Umu-nne Josef abiawo: ọ di nma n'anya Fero, na n'anya ndi-orù-ya.
17. Fero we si Josef, Si umu-nne-gi, Menu nka; bonu anumanu-unu ibu, la, ba n'ala Kenean;
18. chiri-kwa-nu nna-unu na ulo-unu, biakutem: ka m'nye kwa unu ezi ihe nke ala Ijipt, unu gēri kwa urù ala nka.
19. Ma gi onwe-gi ka enyeworo iwu, menu nka; sinu n'ala Ijipt chiri ub͕ọ-ala n'ihi umu-ntakiri-unu, na n'ihi nwunye nile unu, kuru-kwa-nu nna-unu, bia.
20. Anya-unu adi-kwa-la n'ihe-unu; n'ihi na ezi ihe nke ala Ijipt nile, ọ bu unu nwe ya.
21. Umu Israel we me otú a: Josef we nye ha ub͕ọ-ala n'okwu-ọnu Fero, o nye kwa ha ihe ha gēri n'uzọ.
22. Ha nile n'otù ka o nyere uwe-nb͕okwasi nb͕anwe; ma o nyere Benjamin ọgu nkpuru-ego ọla-ọcha iri na ọgu ise na uwe-nb͕okwasi nb͕anwe ise.
23. O ziga-kwa-ra nna-ya otú a; inyinya-ibu iri nēbu ufọdu n'ezi ihe nke Ijipt, na nne-inyinya-ibu iri nēbu ọka na achicha na nri nna-ya gēri n'uzọ.
24. Ọ we zilaga umu-nne-ya, ha la: ọ si ha, Unu esela okwu n'uzọ.
25. Ha si n'Ijipt rigo, ba n'ala Kenean, biakute Jekob nna-ha.
26. Ha gosi ya, si, Josef nọ ndu ub͕u a, ha gosi kwa ya na ọ bu ya nāchi ala Ijipt nile. Obi-ya we b͕afue, n'ihi na ọ kweghi ha.
27. Ha we gwa ya okwu Josef nile nke ọ gwara ha: mb͕e ọ huru ub͕ọ-ala nile nke Josef ziri ibute ya, mọ nke Jekob, bú nna-ha, we di ndu: