28. O rue, n'ọmumu-nwa-ya, na otù setipuru aka: nwayi nke nēle ime anya we were ogho uhie ke n aka-ya, si, Nka buru uzọ puta.
29. O rue na, ka ọ nēseghachi aka-ya, le, nwa-nne-ya nwoke putara: nwayi ahu we si, Gini mere i ji tiwara onwe-gi ntiwa? ewe kpọ aha-ya Perez.
30. Emesia nwa-nne-ya nwoke putara, bú nke nwere ogho uhie n'aka-ya: ewe kpọ aha-ya Zera.