12. Me ka ọ ba uba nke-uku n'isim, bú ego-ilu-nwunye na onyinye, m'gēnye dika unu gāsim, ma nyenum nwa-ab͕ọghọ ahu na nwunye.
13. Umu-ndikom Jekob we were aghughọ za Shekem na Hemoa nna-ya, we kwue, n'ihi na ọ meruru Daina nwa-nne-ha,
14. ha we si ha, Ayi apughi ime ihe a, iwere nwa-nne-ayi nwayi nye nwoke nke anēbighi úgwù; n'ihi na ihe-ita-uta ka ọ buru ayi:
15. ọ bu nání ma asi na unu eme nka ka ayi gēkwere unu: ọ buru na unu gādi ka ayi, ka ebìe nwoke ọ bula n'etiti unu úgwù;