49. Ma ub͕u a, ọ buru na unu gaje ime ebere na ezi-okwu n'ebe onye-nwem nọ, gosinum: ma ọ buru na unu agaghi-eme ya, gosinum; ka m'we che iru n'aka-nri, ma-ọbu n'aka-ekpe.
50. Leban na Betuel we za, si, N'aka Jehova ka okwu a siteworo: ayi apughi igwa gi ihe ọjọ ma-ọbu ezi ihe.
51. Le, Rebeka nọ n'iru gi, kuru ya, la, ka ọ ghọrọ nwa onye-nwe-gi nwunye, dika Jehova kwuworo.
52. O rue, mb͕e orù Abraham nuru okwu nile ha, na ọ kpọrọ isi ala nye Jehova.
53. Orù ahu we chiputa ihe ọla-ọcha, na ihe ọla-edo, na uwe, nye Rebeka: ihe di iche iche nke di oké ọnu-ahia ka ọ nyekwara nwa-nne-ya nwoke na nne-ya.
54. Ha we rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ya onwe-ya na ndi ya na ha yikọrọ bia, ha we nọ ọnọdu-abali; ha we bilie n'ututu, ọ si, Zilagam na nke onye-nwem.
55. Ma nwa-nne-ya nwoke na nne-ya siri, Ka nwa-ab͕ọgho nọyere ayi ubọchi asa ma-ọbu iri; emesia ọ gēje.
56. Ọ si ha, Unu eb͕ochilam, ebe Jehova meworo ka uzọm ga nke-ọma; zilagam ka m'lakuru onye-nwem.
57. Ha si, Ayi gākpọ nwa-ab͕ọghọ ahu, juta ya n'ọnu-ya.
58. Ha we kpọ Rebeka, si ya, Ì gēso nwoke a je? Ọ si, M'gēje.
59. Ha we zilaga Rebeka, bú nwa-nne-ha, na nwayi nyere ya ara na nwata, na orù Abraham, na ndikom-ya.
60. Ha we gọzie Rebeka, si ya, Nwa-nne-ayi, gi onwe-gi ghọ nnù kwuru nnù madu, ọzọ, ka nkpuru-gi nweta ọnu-uzọ-ama nke ndi nākpọ ha asì.
61. Rebeka we bilie, ya na umu-ab͕ọghọ-ya, ha we nọkwasi n'elu camel-ha, so nwoke ahu je: orù ahu we kuru Rebeka, la.
62. Ma Aisak biarari site n'ije Bia-lahai-roi; n'ihi na ya onwe-ya bi n'ala Negeb.
63. Aisak we pua itughari uche-ya n'ọhia na mb͕e anyasi: ọ welie anya-ya abua, hu, ma, le, camel ufọdu nābia.
64. Rebeka we welie anya-ya abua, hu Aisak, si n'elu camel-ya rida.
65. Ọ si orù ahu, Ònye bu nwoke ahu nke nēje ije n'ọhia izute ayi? Orù ahu we si, Onye ahu bu onye-nwem: Rebeka we were ákwà-nkpudo-ya kpuchie onwe-ya.
66. Orù ahu we kọrọ Aisak akukọ bayere ihe nile o mere.