30. Lot we si na Zoa rigo, biri n'ugwu ahu, ya na umu-ya ndinyom abua; n'ihi na ọ turu egwu ibi nime Zoa: ọ we biri n'ọb͕à, ya onwe-ya na umu-ya ndinyom abua.
31. Ada we si nke-ntà, Nna-ayi aghọwo agadi, ma ọ dighi nwoke n'uwa ibakute ayi, dika uzọ uwa nile si di:
32. bia, ka ayi me nna-ayi ka ọ ṅua manya-vine, ka ayi na ya dina kwa, ka ayi we site na nna-ayi debe nkpuru ndu.
33. Ha we me ka nna-ha ṅua manya-vine n'abali ahu: ada we ba, ya na nna-ya we dina; ma nna-ya amaghi mb͕e o dinara, na mb͕e o biliri.
34. O rue n'echi-ya, na ada siri nke-ntà, Le, mu na nnam dinara n'abali nyahuru: ka ayi me ka ọ ṅu kwa manya-vine n'abali a; gi ba kwa, gi na ya dina, ka ayi we site na nna-ayi debe nkpuru ndu.
35. Ha we me ka nna-ha ṅu kwa manya-vine n'abali ahu: nke-ntà we bilie, ya na nna-ya we dina; ma nna-ya amaghi mb͕e o dinara, na mb͕e o biliri.
36. Umu Lot ndinyom abua we turu ime site n'aka nna-ha.
37. Ada we mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Moab: onye ahu bu nna ndi Moab rue ta.
38. Nke-ntà kwa, ya onwe-ya mu-kwa-ra nwa-nwoke, kpọ aha-ya Ben-ami: onye ahu bu nna umu Amon rue ta.