13. Onye nāzaghachi okwu tutu ọ nu,Uche b͕agaọrọ ab͕agọ na ọnọdu-ihere ka ọ buru ya.
14. Mọ madu gānagide ọria-ya;Ma mọ madu nke etib͕uru etib͕u, ònye gēburu ya?
15. Obi onye-nghọta nēnweta ihe-ọmuma;Ọzọ, nti ndi mara ihe nāchọ ihe-ọmuma.
16. Onyinye madu nākwara ya uzọ sara mbara,Ọ bu kwa n'iru ndi uku ka o nēdu ya je.
17. Onye ezi omume n'anya ndi-ikpe ka onye ahu bu nke buru uzọ kpe ọnu-ya;Ma madu-ibe-ya abia gwuputa ala okwu-ya.
18. Ife-nzà nēme ka ise-okwu kwusi,Ọ bu kwa ndi nwere ume ka ọ nēkewa.
19. Nwa-nne ejehieworo megide di ike iwere kari obodo siri ike:Ise-okwu di kwa ka ihe-ntuchi nile nke-elu.
20. Site na nkpuru nke ọnu onwe-ya ka afọ gēju afọ onye ọ bula;N'ihe-omume nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya ka afọ gēju ya.
21. Ọnwu na ndu di ire n'aka;Ọzọ, ndi nāhu ya n'anya gēri nkpuru-ya.
22. Onye chọtaworo nwunye achọtawo ezi ihe,Ọ gēnweputa kwa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ.
23. Okwu aririọ-amara di iche iche ka ob͕eye nēkwu:Ma ọgaranya nāza ike ike.
24. Onye nēnwe ọtutu eyì nēnwe ha ibibi onwe-ya:Ma onye nāhu n'anya di nārapara n'aru kari nwa-nne.