1. Ọziza-okwu di nrò nēme ka ọnuma laghachi azu:Ma okwu nwuta nākpali iwe.
2. Ire ndi mara ihe nēme ka ihe-ọmuma di nma:Ma ọnu ndi-nzuzu nēkwuwa okwu uche b͕agọrọ ab͕agọ.
3. N'ebe nile ọ bula ka anya abua nke Jehova di,Nēche ndi ọjọ na ndi bu ezi madu nche.
4. Ire nke nāgwọ madu bu osisi nēnye ndu:Ma omume b͕agọrọ ab͕agọ nime ya bu ntipia nime mọ madu.
5. Onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ nēlelì idọ-aka-na-nti nna-ya:Ma onye nāriba iba-nba ama gaghọ onye nwere ezi uche.
6. N'ulo onye ezi omume ka ọtutu àkù di:Ma n'ihe-omume nke onye nēmebi iwu ka nmekpa-aru di.
7. Eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi mara ihe nēfesa ihe-ọmuma:Ma obi ndi-nzuzu adighi-eme otú a.