1. Nwa nke mara ihe nānu idọ-aka-na-nti nna-ya:Ma onye nākwa emò anughi ibasi-nba-ike.
2. Site na nkpuru nke ọnu-ya ka onye ọ bula gēri ezi ihe:Ma nkpuru-obi ndi nāghọb͕u aghọb͕u gēri ime-ihe-ike.
3. Onye nēche ọnu-ya nche nēdebe ndu-ya:Ma onye nāsaghepu eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua, nbibi gādiri ya.
4. Ọ nāchọsi ike, ma ọ dighi ihe o nwere, bú nkpuru-obi onye-ume-ngwu:Ma nkpuru-obi nke ndi di nkọ, agēme ya ka ọ ma abuba.
5. Okwu-ugha ka onye ezi omume nākpọ asì:Ma onye nēmebi iwu nēsì ísì, we nwe iru-ihere.
6. Ezi omume nēchebe onye zuru okè n'uzọ:Ma nmebi-iwu nēme ka onye-nmehie kpùe iru.
7. O nwere onye nēme onwe-ya ọgaranya, ma ọ dighi ihe ọ bula o nwere:O nwere onye nēme onwe-ya ob͕eye, ma àkù-ya bara uba.
8. Ihe-nb͕aputa nke ndu onye ọ bula bu àkù-ya:Ma ob͕eye anughi ibasi-nba-ike.
9. Ìhè ndi ezi omume nāṅuri ọṅu:Ma oriọna ndi nēmebi iwu gānyu.
10. Nání na nganga ka ilu-ọ̀gù nāputa:Ma n'aka ndi aduworo ọdu ka amam-ihe di.
11. Àkù nke sitere n'ihe-efu gēbilata:Ma onye ji aka-ya achikọta ihe gāba uba.