15. Àkù nke ọgaranya bu obodo-ya siri ike:Nbibi nke ndi nēnweghi ike bu ob͕eye ha bu.
16. Ọlu onye ezi omume nēdubà na ndu;Ihe-omume nke onye nēmebi iwu nēdubà na nmehie.
17. Uzọ iru na ndu ka onye nēdebe idọ-aka-na-nti bu:Ma onye nārapu iba-nba nēme ka madu kpafue.
18. Onye nēkpuchi ikpọ-asì nwere eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha;Ọzọ, onye nēme ka akukọ ọjọ puta, onye ahu bu onye-nzuzu.
19. N'ọtutu okwu njehie adighi-akwusi:Ma onye nēb͕ochi eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua bu onye nwere uche.
20. Ọla-ọcha arọputara arọputa ka ire onye ezi omume bu:Obi ndi nēmebi iwu di ka ihe ntà.
21. Eb͕ub͕ere-ọnu abua nke onye ezi omume nāzù ọtutu madu:Ma ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha nānwu n'ihi na obi amam-ihe kọrọ ha.
22. Ngọzi Jehova, nke ahu nēme madu ọgaranya,Ọ dighi-atukwasi kwa ya ihe-nwuta.
23. Ọ diri onye-nzuzu dika igwuri-egwú, bú ime ihe-nzube ọjọ:Otú a ka amam-ihe di-kwa-ra onye-nghọta.