Mb͕e ahu Tatenai, bú onye nāchi ala n'ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ha, dika ozi ahu si di nke Daraiọs, bú eze, ziri, otú a ka ha were ngwa ngwa me.