10. Asi na ọ muwo nwa nke bu onye nke nēme ihe-ike, onye nāwusi ọbara, nke nēme otù ihe ọ bula n'ihe ndia,
11. ma ezi ihe ndia nile ka ọ nēmeghi, n'ihi na ọbuná n'ugwu ka o riworo ihe, ọ bu kwa nwunye madu-ibe-ya ka o meruworo,
12. onye ewedara n'ala na ob͕eye ka o meworo ihe-ike, ọ punarawo madu ihe n'ike, ọ dighi-enyeghachi ihe-ibe, ọ bu kwa arusi nile ka o weliworo anya-ya abua le, ihe-árú ka o meworo,
13. n'uma ka o nyeworo ego, ọ bu kwa ọmuru-nwa ka ọ naraworo: ọ̀ gādi kwa ndu? ọ gaghi-adi ndu: ihe-árú ndia nile ka o meworo: aghaghi ime ka ọ nwua; ọbara-ya gādi ya n'isi.
14. Ma, le, asi na ọ muwo nwa, o we hu nmehie nile nke nna-ya, nke o meworo, o we tua egwu, ghara ime ihe dika ihe ndia,
15. o righi ihe n'elu ugwu, o welighi anya-ya abua le arusi nile nke ulo Israel, o merughi nwunye madu-ibe-ya,
16. o meghi onye ọ bula ihe-ike, ọ naraghi ihe-ibe, ọ punaraghi madu ihe n'ike, nri-ya ka o nyeworo onye-agu, onye-ọtọ ka o kpuchiworo uwe,
17. o siwo n'aru onye ewedara n'ala seghachi aka-ya, uma na ọmuru-nwa ka ọ nānaraghi, ikpém nile ka o meworo, n'ukpurum nile ka o jeghariworo; onye ahu agaghi-anwu n'ihi ajọ omume nke nna-ya, ọ ghaghi idi ndu.
18. Ma nna-ya, n'ihi na ọ meb͕uru nke-uku, punara nwa-nne-ya ihe n'ike, me ihe nke nādighi nma n'etiti ndi-ya, le, ọ gānwu kwa n'ajọ omume-ya.
19. Ma unu asiwo, Gini mere nwa nējighi ebu ufọdu n'ajọ omume nna-ya? Mb͕e nwa ahu meworo ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, debe ukpurum nile, me ha, ọ ghaghi idi ndu.