19. Nime nrubiga-ókè-iwe nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha ka erechapuworo ala: ndi nka we di ka nri ọku; onye ọ bula adighi-enwe ọmiko n'aru nwa-nne-ya.
20. O we b͕utue n'aka-nri, ma agu nāgu ya: ọ we rie ihe n'aka-ekpe, ma afọ ejughi ha: ha gēri, onye ọ bula anu-aru nke ogwe-aka-ya:
21. Manase gēmegide Efraim, Efraim gēmegide kwa Manase: ndi ahu abua gēmegide Juda. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.