1. Ọzọ, ndinyom asa gējide otù nwoke n'ubọchi ahu, si Nri nke aka ayi ka ayi gēri, uwe nke aka ayi ka ayi gēyi kwa: ọ bu nání na agākpọkwasi ayi aha-gi; gi wepu ita-uta-ayi.
2. N'ubọchi ahu ka ihe-opupú nke Jehova gāghọ ihe mara nma na ihe-nsọpuru, nkpuru nke ala gāghọ-kwa-ra ndi Israel b͕apuru ab͕apu nbili-elu na ima-nma.
3. O gēru kwa, na onye emeworo ka ọ fọdu na Zaion, na onye fọduru na Jeruzalem, onye nsọ ka agākpọ ya, bú onye ọ bula nke edeworo ya n'akwukwọ idi ndu nime Jerusalem:
4. mb͕e Onye-nwe-ayi gāsachapuwori inyi umu-ndinyom Zaion, ṅachapu kwa ọbara Jerusalem n'etiti ya, site na Mọ nke ikpé, na site na Mọ nke nkpochapu.