1. Jehova, Chineke nke nzọputam,N'ehihie ka m'tiworo nkpu, n'abali kwa, n'iru Gi:
2. Kwe ka ekperem bata n'iru Gi;Tọ nti-Gi n'ala n'iti-nkpum:
3. N'ihi na afọ ihe ọjọ di iche iche ejuwo nkpuru-obim,Ndum abiaruwo kwa nso ala-mọ.
4. Aguwom na ndi nārida n'olùlù;Aghọwom onye di ka nwoke nēnweghi ike:
5. Anọm n'etiti ndi nwuru anwu, buru onye nwere onwe-ya,Dika ndi eb͕uru eb͕u ndi nēdina n'ílì,Ndi I nēchetaghi ọzọ;Ndi ahu bu kwa ndi ebipuworo n'aka-Gi.
6. I tọb͕ọwom n'olùlù dichasi ala,N'ebe di iche iche b͕ara ọchichiri, nime miri di omimi.
7. Ọnuma-Gi akwagidewom,I werewo kwa ebili-miri-Gi nile wedam n'ala. Selah
8. I mewo ka ndi m'mara nke-ọma nọm n'ebe di anya;I mewom ka m'ghọrọ ha ihe-árú:Abum onye eb͕ochiworo, adighm-apu kwa n'èzí.