1. Ka Chineke mere ayi amara, gọzie ayi,Me ka iru-Ya mua n'ebe ayi nọ; Selah
2. Ka ewe mara uzọ-Gi n'uwa,Mara nzọputa-Gi n'etiti mba nile.
3. Ka ndi nile n'uwa kele Gi, Chineke;Ka ndi nile n'uwa kele Gi, ha nile.
4. Ka mba nile ṅuria, ti kwa nkpu ọṅù:N'ihi na I gēkpe ndi nile n'uwa ikpe ziri ezi,Mba nile n'uwa ka I gēdu kwa. Selah
5. Ka ndi nile n'uwa kele Gi, Chineke;Ka ndi nile n'uwa kele Gi, ha nile.
6. Ala emewo ihe-ọmume-ya:Chineke, bú Chineke-ayi, gāgọzi ayi.
Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 67