1. Unu ndi nile di iche iche, kuanu aka;Werenu olu nke iti-nkpu-ọṅu tikue Chineke.
2. N'ihi na Jehova, Onye kachasi ihe nile elu, di egwu;Ọ bu Eze uku nāchi uwa nile.
3. Ọ nēdu ndi nile di iche iche bia n'okpuru ayi,Ọ nēdu kwa mba nile bia n'okpuru ukwu-ayi.
4. Ọ nārọputara ayi ihe-nketa-ayi,Bú nbili-elu nke Jekob, onye Ọ huru n'anya. Selah
5. Chineke ewerewo iti-nkpu rigo,Jehova ewerewo olu opì-ike rigo.
6. Bùkuenu Chineke abù ọma, bùkuenu Ya abù ọma:Bùkuenu Eze-ayi abù ọma, bùkuenu Ya abù ọma.
7. N'ihi na Eze nke uwa dum ka Chineke bu:Bùkuenu Ya abù ọma, maschil.