6. Akpọwom ha asì, bú ndi nāriba ihe-efu nile nke nābughi ihe ama:Ma mu onwem atukwasiwo obi na Jehova.
7. Ka m'tegharia egwú ọṅu, ṅuri kwa ọṅu, n'ebere-Gi:N'ihi na I huwo nweda-n'alam;I mawo nkpuru-obim n'ahuhu di iche iche:
8. I mechibidoghkwam nye n'aka onye-iro;I mewo ka ukwum abua guzo n'ebe sara mbara.
9. Merem amara, Jehova, n'ihi na anọm na nkpab͕u:Anyam emebiwo nime nkpasu-iwem, ya na nkpuru-obim, na afọm, dika uwe nla mebiri.
10. N'ihi na ndum agwusiwo n'iru-újú, na arọm nile n'ize-ume:Ikem asuwo ngọngọ site n'ajọ omumem, ọkpukpum nile emebiwo kwa, dika uwe nla mebiri.
11. N'ihi ndi-nkpab͕um nile aghọwom ihe-ita-uta nke-uku,Ọbuná n'ebe ndi-ab͕ata-obim nọ aghọwo-kwa-ram ndi m'mara oké egwu:Ndi nāhum n'èzí ab͕anariwom.
12. Echezọwo mu onwem dika onye nwuru anwu puru n'obi madu:Aghọwom ihe nāla n'iyì.
13. N'ihi na anuwom akukọ ọjọ nke ọtutu madu,Ujọ dim buruburu:Mb͕e ha nāb͕a ìzù n'otù imegidem,Ha zubere iwepu ndum.
14. Ma mu onwem, ọ bu Gi ka m'tukwasiworo obi, Jehova:Asiwom, Chinekem ka I bu.
15. N'aka-Gi ka mb͕em nile di:Naputam n'aka ndi-irom, na n'aka ndi nēsob͕um.
16. Me ka iru-Gi nye orù-gi ìhè:Zọputam n'ihi ebere-Gi.
17. Jehova, ekwela ka ihere mem; n'ihi na akpọkuwom I:Ka ihere me ndi nēmebi iwu, ka ha debe ọnu-ha du n'ala-mọ.
18. Ka eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha da ob͕i;Nke nēkwu oké okwu megide onye ezi omume,Nime npako na nleda-anya.