4. Otù ihe ka m'riọworo n'aka Jehova, nke ahu ka m'nāchọ;Ọ bu ka m'biri n'ulo Jehova ubọchi nile nke ndum,Ihu idi-utọ Jehova, na ijuta ihe n'ulo uku Ya.
5. N'ihi na Ọ gēdebem na nzuzo n'ulo-ntu-Ya n'ubọchi ihe ọjọ:Ọ gēzobem n'ebe-nzuzo nke ulo-ikwū-Ya;N'oké nkume ka Ọ gēbulim elu.
6. Ma ub͕u a agēbuli isim elu n'elu ndi-irom dim buruburu;M'ga-achukwa àjà nke iti-nkpu n'ulo-ikwū-Ya;M'gābù abù, m'gābùku kwa Jehova abù ọma.
7. Jehova, nuru mb͕e m'were olum kpọ òkù:Me-kwa-ram amara, zakwam.
8. Gi ka obim siworo, Gi kwuru okwu, si, Chọnu irum;Iru-Gi, Jehova, ka m ga-achọ.
9. Ezonarilam iru-Gi;Ejila iwe wezuga orù-Gi:Iye-akam ka I buworo;Ab͕anarilam, arapu-kwa-lam, Chineke nke nzọputam.
10. N'ihi na nnam na nnem arapuwom,Ma Jehova gēkubatam.
11. Jehova, zím uzọ-Gi;Durukwam n'okporo-uzọ di lari,N'ihi ndi nēchem anwu.