7. Ala we me nkpatu ma kwa jijiji,Ntọ-ala nile nke ugwu nile nāma kwa jijiji,Ewe me ka ha me nkpatu, n'ihi na iwe-Ya di ọku.
8. Anwuru-ọku rigoro n'imi-Ya,Ọku nēsi kwa n'ọnu-Ya ripia:Afunwuru icheku site na ya.
9. O rulata-kwa-ara elu-igwe, rida;Oké ọchichiri di kwa n'okpuru ukwu-Ya abua.
10. O we nọkwasi n'elu cherub dika inyinya, we felie:O we fesie ike n'elu nkù ìfùfè.
11. Ọ nēdo ọchichiri ka ọ buru ebe-nzuzo-Ya, ka ọ buru ulo-ntu-Ya nke di Ya buruburu;Bú ọchichiri miri, igwe-oji b͕ara ọchichiri nke mbara-ígwé.
12. Site n'onwunwu nke nēnwu n'iru Ya igwe-oji-Ya nile nke b͕ara ochichiri gabigara,Akú-miri-ígwé na icheku ọku.
13. Jehova we ma éb͕è-elu-igwe n'elu-igwe,Onye kachasi ihe nile elu nēme kwa ka olu-Ya da;Ákú-miri-ígwé na icheku ọku.
14. O we b͕a àkú-Ya, me ka ha b͕asa;Ọtutu àmùmà kwa, O we chusa ha.
15. Ewe hu ebe nile miri si erù,Anēkpughe kwa ntọ-ala nile nke elu-uwa dum madu bi,Site n'ibasi-nba-ike-Gi, Jehova,Site nume nke iku-ume nke imi-Gi.
16. O si n'elu zìe, kurum,Dọputam n'ọtutu miri.
17. Ọ nānaputam n'aka onye-irom di ike,Na n'aka ndi nākpọm asì, n'ihi na ha nwere ume karim.