2. N'ihi na ọnu onye nēmebi iwu na ọnu aghughọ ka ha sagheworo megidem:Ha ewerewo ire okwu-ugha gwam okwu.
3. Ha ewerewo kwa okwu ikpọ-asì b͕am buruburu,We busom agha n'efu.
4. N'ọnọdu ihu-n'anya m'huru ha ha nēmegidem:Ma mu onwem nọ nēkpe ekpere.
5. Ha we tukwasim ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe,Na ikpọ-asì n'ọnọdu ihu-n'anyam.
6. Me ka onye nēmebi iwu lekọta ya:Ka onye-nmegide guzo kwa n'aka-nri-ya.
7. Mb͕e anēkpe ya ikpe, ya puta ìhè na ọ bu onye ikpe mara;Ka ekpere-ya ghọ kwa nmehie.
8. Ka ubọchi-ya di ole-na-ole;Ka onye ọzọ nara ya ihe-nlekọta-ya.
9. Ka umu-ya buru umu-nb͕ei,Ka nwunye-ya buru nwayi di-ya nwuru.
10. Ka umu-ya nāṅaghari kwa mb͕e nile nāriọ kwa aririọ;Ka ha si kwa na nkponkpọ-ebe-ha nile nāchọ ihe-oriri-ha n'ebe di anya.
11. Ka onye-nbinye siri ihe nile o nwere ọnyà;Ka ndi ala ọzọ luta ihe ọ dọb͕uru onwe-ya n'ọlu inweta n'agha.
12. Ekwela ka o nwe onye nọ nēmere ya ebere;Ekwe-kwa-la ka onye ọ bula di nke nēmere umu-nb͕ei-ya amara.
13. Ka eriri-umu-ya diri nbipu;N'ọb͕ọ soro ha ka ehichapu aha-ha.
14. Ka echetara Jehova ajọ omume nna-ya-hà;Ekwe-kwa-la ka ehichapu nmehie nne-ya.