1. Tonu Ja.Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
2. Ònye gākọ akukọ idi-ike nile nke Jehova?Ònye gēme ka anuru otuto-Ya nile?
3. Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēdebe ikpé bu,Ha na onye nēme ezi omume na mb͕e nile.
4. Chetam, Jehova, were ka ihe ndi-gi si atọ Gi utọ chetam;Were nzọputa-Gi letam:
5. Ka m'we lekwasi ọdi-nma nke ndi I rọputaworo,Ka m'we ṅuria n'ọṅù mba-Gi,Ka m'we soro ihe-nketa-Gi nya isi.
6. Ayi esowo nna-ayi-hà mehie,Ayi emewo ajọ omume, ayi emebiwo iwu.
7. Nna-ayi-hà enweghi uche ighọta oké ọlu-Gi nile n'Ijipt;Ha echetaghi iba-uba nke ebere-Gi nile;Ha we nupu isi n'akuku oké osimiri, bú n'Oké Osimiri Uhie.
8. Ma Ọ zọputara ha n'ihi aha-Ya,Ime ka amara idi-ike-Ya.
9. O we basiere Oké Osimiri Uhue nba, o we tasia:O we me ka ha nēje ije n'ob͕u-miri-ya nile dika ọ bu ọzara.
10. O we zọputa ha n'aka onye nākpọ ha asì,B͕aputa kwa ha n'aka onye-iro-ha.
11. Miri we kpuchie ndi nākpab͕u ha:Ọ dighi otù onye nime ha fọduru.