25. Oké osimiri ka nka bu, nke di uku, nke sa-kwa-ra mbara n'aka abua,Ebe ihe nākpu akpu di nke nādighi ọnu-ọgugu,Anu di iche iche, ma anu ntà ma anu uku.
26. N'ebe ahu ka ub͕ọ nile nāga;Leviatham kwa, nke I kpuworo igwuri egwú nime ya.
27. Ha nile nēle anya Gi,Inye ha ihe-oriri-ha na mb͕e-ya.
28. I nēnye ha, ha achikọta ya;I nāsaghe aka-Gi, afọ ezi ihe eju ha.
29. I nēzobe iru-Gi, ha ama jijiji;I nāchikọta mọ-ha, ha ekubìe ume,We laghachi n'ájá-ha.
30. I nēzipu Mọ-Gi, ekè ha;I we me ka iru ala di ọhu.