14. Ndi-okenye akwusiwo inọ n'ọnu-uzọ-ama,Umu-okorọbia akwusiwo ikpọ ubọ-akwara-ha.
15. Obi-utọ nke obi-ayi akwusiwo;Otite-egwú-ayi ab͕anwewo n'ib͕a-nkpe.
16. Okpu-eze nke isi-ayi adawo n'ala:Ahuhu nādiri ayi nọ̄! n'ihi na ayi emehiewo.
17. N'ihi nka ka aru nādighi obi-ayi nma;N'ihi ihe ndia ka anya-ayi b͕aworo ọchichiri.
18. N'ihi ugwu Zaion, nke tọb͕ọrọ n'efu;Nkita-ọhia ejeghariwo na ya.
19. Gi onwe-gi, Jehova, ọ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka I nānọdu dika eze;Oche-eze-Gi nādiru ọb͕ọ nile.
20. N'ìhi gini ka I nēchezọ ayi rue mb͕e ebighi-ebi?N'ìhi gini ka I nārapu ayi rue ogologo ubọchi nile?
21. Me ka ayi laghachikute Gi, Jehova, ayi gālata kwa;Me ka ubọchi nile ayi di ọhu dika na mb͕e ochie.
22. Ma-ọbughi na I jusiwo ayi,Wesa ayi iwe nke-uku.