1. Le, ka ọla-edo si echu echu nke-uku! le, ka ọla-edo nke makarisiri nma si ab͕anwe!Anāwusi nkume nile nke ebe nsọ n'isi èzí nile ọ bula.
2. Umu Zaion nke di oké ọnu-ahia, ndi eji turu ọla-edo anuchara anucha,Le otú aguworo ha n'ite urọ, bú ọlu aka ọkpu-ite!
3. Ọbuná nkita-ọhia eseputawo ara, me ka umu-ha ṅua ara:Ada ndim aghọwo onye nēnweghi obi-ebere, dika enyi-nnunu n'ọzara.
4. Iré nke nwa nke nāṅu ara araparawo n'okpo-ọnu-ya site n'akpiri-ikpọ-nku:Umu-ntakiri nāriọ nri, ma ọ dighi onye nēkesara ha.
5. Ndi nēri nání ihe utọ di iche iche tọb͕ọrọ n'efu n'èzí nile:Ndi azùputaworo n'uwe uhie amakuwo ebe-ikpofu-ahihia.
6. Ajọ omume nke ada ndim we di uku kari nmehie Sọdọm,Nke akwaturu dika n'otù ntabi-anya, ma ọ dighi aka ọ bula dakwasiri ya.
7. Ndi-Nazirait-ya di ọcha kari snow, ha nwuru enwu kari miri-ara-ehi,Ha chara ọbara-ọbara n'aru kari ruby, dika sapphire ka udi-ha di.
8. Udi-aru-ha ab͕awo ọchichiri kari iji-nji; amataghi ha n'èzí:Akpukpọ-ha araparawo n'ọkpukpu-ha; ọ kpọnwuwo, ọ ghọwo ihe di ka osisi.
9. Ndi mma-agha b͕uworo adiwo nma kari ndi agu gub͕uworo;N'ihi na ndia nērùpu dika miri, buru ndi adupuworo adupú, ghara inwe ihe-omume nke ubi.
10. Aka ndinyom ndi nwere obi-ebere esiwo umu-ha n'ite;Ha aghọworo ha ihe-oriri na ntipia nke ada ndim.
11. Jehova emezuwo ọmuma-Ya, Ọ wupuwo iwe-Ya di ọku;O we suye ọku nime Zaion, o we ripia ntọ-ala-ya nile.
12. Ndi-eze uwa ekweghi, ndi nile bi n'elu-uwa dum madu bi ekweghi kwa,Na onye-nkpab͕u na onye-iro gābà n'ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem.
13. O sitere na nmehie nile nke ndi-amuma-ya, na ajọ omume nile nke ndi-nchu-àjà-ya,Ndi nāwusi ọbara ndi ezi omume n'etiti ya.
14. Ha aṅaghariwo dika ndi-ìsì n'èzí nile, ejiwo ọbara meru ha,Madu we ghara inwe ike imetu uwe-ha aka.
15. Wezuganu onwe-unu, ka ha kpọrọ ha òkù, Onye ruru árú! wezuganu onwe-unu, wezuganu onwe-unu, unu emetula aka:Mb͕e ha b͕apuru ha ṅaghari-kwa-ra; madu siri n'etiti mba nile, Ha agaghi-anọ kwa ọnọdu-abali ọzọ n'ebe a.