8. M'we nye gi ulo onye-nwe-gi, na ndinyom onye-nwe-gi n'obi-gi, nye kwa gi ulo Israel na nke Juda; ma ọ buru na nke ahu di ntà, M'gātukwasi-kwa-ra gi otú a na otú a.
9. Gini mere i ji lelì okwu Jehova, ime ihe jọrọ njọ n'anya-Ya? i werewo mma-agha tib͕ue Uraia onye Het, nwunye-ya ka i werewo-kwa-ra n'onwe-gi na nwunye; ma ya onwe-ya, i werewo mma-agha umu Amon b͕ue ya.
10. Ma ub͕u a mma-agha agaghi-ewezuga onwe-ya n'ulo-gi rue mb͕e ebighi-ebi; n'ihi na i lelìwom, we kuru nwunye Uraia onye-Het ka ọ ghọrọ gi nwunye.
11. Otú a ka Jehova siri, Le, M'nēme ka ihe ọjọ si n'ulo-gi bilie imegide i, M'gāchiri kwa ndinyom-i n'anya-gi nye ibe-gi, ọ gēso kwa ndinyom-i dina n'anya anyanwu a.
12. N'ihi na gi onwe-gi mere ya na nzuzo: ma Mu, onwem gēme ihe a n'iru Israel nile, na n'iru anyanwu.
13. Devid we si Netan, Emehiewom megide Jehova. Netan we si Devid, Jehova emewo kwa ka nmehie-gi gabiga; i gaghi-anwu.
14. Otú ọ di, n'ihi na i mewo ka ndi-iro Jehova kpọlu nkpọlu nke-uku n'okwu a, nwa-nwoke nke amuru gi aghaghi inwu kwa.
15. Netan we la n'ulo-ya.Jehova we tie nwata ahu ihe-otiti, bú nke nwunye Uraia muru nye Devid, o we nāria ọria nke-uku.
16. Devid we riosie Chineke aririọ ike bayere nwata ahu; Devid we nēbu ọnu, ba nime, dina ala ogologo abali nile.
17. Ndi-okenye ulo-ya we bilie n'akuku ya, ime ka o si n'ala bilie: ma o kweghi, o soghi kwa ha ri nri.