Ma Elaisha gwara nwayi ahu okwu, bú onye o mere ka nwa-ya nwoke di ndu, si, Bilie, je, gi onwe-gi na ulo-gi, nọ dika ọbìa n'ebe ọ bula i gānọ dika ọbìa: n'ihi na Jehova akpọwo oké unwu ka ọ da: ọzọ kwa, ọ gābiakwasi ala arọ asa.